Naịjirịa Ọbụ Nke Onye? - IKORO Oct 26 2020
N'ihe metụtara ọlaedo n'ugwu Awụsa na n'obodo Zamfara, Naịjirịa na-eme ya bụ akụ si na ihe a na-egwuputa n'ime ala ka ọ ga-asị na "nkem bụ nkem, nke gị bụ nke anyị." Ọ bụ ihe dị mma na o rue na mmanụ ọkụ si na ndịda Naịjirịa, e mee agbata ekee ma ụlọ akụ etiti Naịjirịa na-akwụ obodo Zamfara ụgwọ maka ọlaedo si obodo ahụ? Asị na emee nwata ka emere ibe ya obi adị ya mma. Na nke dịka ibe ya, ngagharị iwe zuru Naịjirịa ọnụ banyere mmegbu na mpụ sitere n'aka ndị SARS (ma ewezuga imerime mba dị n'ugwu Awụsa nwekwara ndị Fulani). Ụmụ okoro na agbọghọ ajụla na ya bụ ajọ omume atụọla ya. #ENDSARS #SARSMUSTEND #ACCOUNTABILITY